Diuteronomi 1

“O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu,

Deuteronomy 1:35 (UKJV) Surely there shall not one of these men of this evil generation see that good land, which I swore to give unto your fathers.

33bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso.

34Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị,

35“O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu,

36karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”

37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.