34Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị,
35“O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu,
36karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”
37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ!
38Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.