36karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”
37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ!
38Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.
39Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa.
40Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.”