42Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’ ”
43Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu.
44Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa.
45Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị.
46Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh.