2Aga m edekwasị nʼelu mbadamba nkume ndị a, okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ, bụ nke ị tụpịasịrị. Ị ga-etinyekwa ha nʼime igbe ahụ.”
3Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ.
4Onyenwe anyị dere nʼelu mbadamba nkume ahụ ihe ndị ahụ o dere na mbụ, bụ iwu iri ndị ahụ o gwara unu nʼelu ugwu site nʼime ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. Onyenwe anyị nyekwara m ha.
5Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka Onyenwe anyị nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
6(Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja.