1Hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, na-edebezukwa ikpe ya na ụkpụrụ ya na ihe niile o nyere nʼiwu.
2Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya,
3ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile.