Diuteronomi 11

ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile.

Deuteronomy 11:3 (UKJV) And his miracles, and his acts, which he did in the midst of Egypt unto Pharaoh the king of Egypt, and unto all his land;

1Hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, na-edebezukwa ikpe ya na ụkpụrụ ya na ihe niile o nyere nʼiwu.

2Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya,

3ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile.

4Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu Onyenwe anyị si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi.

5Ọ bụghị ụmụ unu hụrụ ihe o meere unu nʼoge ahụ niile unu nọ nʼọzara tutu unu erute nʼebe a,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.