Diuteronomi 11

Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.

Deuteronomy 11:19 (UKJV) And all of you shall teach them your children, speaking of them when you sit in yours house, and when you walk by the way, when you lie down, and when you rise up.

17Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu.

18Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.

19Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.

20Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.

21Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke Onyenwe anyị kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.