16Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha.
17Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu.
18Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
19Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
20Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.