14ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv.
15Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere.
16Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha.
17Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu.
18Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.