27Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.
28Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị.
29Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu.
30Gerizim na Ebal bụ ugwu dị nʼofe Jọdan, nʼakụkụ okporoụzọ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dị nso nʼebe osisi ukwu ndị ahụ toro na More, nʼala ndị Kenan ahụ bi nʼAraba, nʼakụkụ Gilgal.
31Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya,