25Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.
26Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ.
27Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.
28Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị.
29Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu.