Diuteronomi 11

Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.

Deuteronomy 11:25 (UKJV) There shall no man be able to stand before you: for the LORD your God shall lay the fear of you and the dread of you upon all the land that all of you shall tread upon, as he has said unto you.

23Onyenwe anyị ga-achụpụ mba niile bi nʼala ahụ unu na-aga inweta, unu ga-anapụkwa ha ala ahụ, ọ bụladị na ha buru ibu, siekwa ike karịa unu.

24Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu.

25Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.

26Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ.

27Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.