Diuteronomi 11

Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ.

Deuteronomy 11:26 (UKJV) Behold, I set before you this day a blessing and a curse;

24Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu.

25Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.

26Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ.

27Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.

28Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.