Diuteronomi 11

Lezienụ anya debe iwu ndị a m na-enye unu taa, ka unu nwee ike, baa bichikwaa ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta,

Deuteronomy 11:8 (UKJV) Therefore shall all of you keep all the commandments which I command you this day, that all of you may be strong, and go in and possess the land, where all of you go to possess it;

6na ihe o mere Datan na Abiram, ụmụ Eliab, ndị si nʼebo Ruben, otu ala si meghee ọnụ ya loda ha, ha na ezinaụlọ ha, ụlọ ikwu ha na ihe ọbụla nke dị ndụ ha nwere nʼetiti Izrel niile.

7Ma ọ bụ anya unu hụrụ oke ihe ịtụnanya ndị a niile Onyenwe anyị mere.

8Lezienụ anya debe iwu ndị a m na-enye unu taa, ka unu nwee ike, baa bichikwaa ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta,

9ka unu bie ogologo ndụ nʼime ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna unu ha, na ụmụ ụmụ ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.

10Nʼihi na ala a unu na-aga ịbanye nʼime ya inweta adịghị ka ala Ijipt, ebe unu si pụta, ebe ị na-agha mkpụrụ gị, were ụkwụ tụwara mmiri ụzọ, dịka a na-eme nʼubi akwụkwọ nri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.