8Lezienụ anya debe iwu ndị a m na-enye unu taa, ka unu nwee ike, baa bichikwaa ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta,
9ka unu bie ogologo ndụ nʼime ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna unu ha, na ụmụ ụmụ ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
10Nʼihi na ala a unu na-aga ịbanye nʼime ya inweta adịghị ka ala Ijipt, ebe unu si pụta, ebe ị na-agha mkpụrụ gị, were ụkwụ tụwara mmiri ụzọ, dịka a na-eme nʼubi akwụkwọ nri.
11Ma ala unu na-agafe Jọdan inweta bụ ala nwere ugwu na ndagwurugwu, nke na-aṅụ mmiri ozuzo si nʼeluigwe.
12Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya.