Diuteronomi 11

Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya.

Deuteronomy 11:12 (UKJV) A land which the LORD your God cares for: the eyes of the LORD your God are always upon it, from the beginning of the year even unto the end of the year.

10Nʼihi na ala a unu na-aga ịbanye nʼime ya inweta adịghị ka ala Ijipt, ebe unu si pụta, ebe ị na-agha mkpụrụ gị, were ụkwụ tụwara mmiri ụzọ, dịka a na-eme nʼubi akwụkwọ nri.

11Ma ala unu na-agafe Jọdan inweta bụ ala nwere ugwu na ndagwurugwu, nke na-aṅụ mmiri ozuzo si nʼeluigwe.

12Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya.

13Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe,

14ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.