Diuteronomi 12

Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta.

Deuteronomy 12:1 (UKJV) These are the statutes and judgments, which all of you shall observe to do in the land, which the LORD God of your fathers gives you to possess it, all the days that all of you live upon the earth.

1Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta.

2Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.

3Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.