Diuteronomi 12

Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ.

Deuteronomy 12:10 (UKJV) But when all of you go over Jordan, and dwell in the land which the LORD your God gives you to inherit, and when he gives you rest from all your enemies round about, so that all of you dwell in safety;

8Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,

9nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.

10Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ.

11Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya.

12Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.