Diuteronomi 12

Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,

Deuteronomy 12:8 (UKJV) All of you shall not do after all the things that we do here this day, every man whatsoever is right in his own eyes.

6Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara Onyenwe anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu.

7Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu.

8Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,

9nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.

10Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.