5A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye ọrọ nrọ ahụ nke chọrọ iduhie unu, nʼihi na ọ chọrọ iweta nnupu isi megide Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, onye gbapụtara unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu. Ihe ọ chọrọ ime bụ iduhie gị, ka ị ghara ibi ụdị ndụ ahụ Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka i bie. Ọnwụ ya ga-eme ka i wezuga ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
6Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị,
7chi nke ndị ala ahụ gbara unu gburugburu, ma ha bụ ndị bi gị nso ma ha bụ ndị bi nʼebe dị anya, site nʼotu nsọtụ nke ala ahụ ruo nsọtụ nke ọzọ),
8ekwenyekwala maọbụ ṅaa ntị nʼihe ọ na-ekwu. Enwekwala obi ebere nʼebe ọ nọ, ekpuchikwala atụmatụ ọjọọ ya niile.
9Ị ghaghị igbu ha. Buru ụzọ setịpụ aka gị tụọ ya nkume, ka ndị ọzọ soro gị tugbuo ya.