22Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.
23Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.
24Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),
25mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara.
26Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.