Diuteronomi 14

Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.

Deuteronomy 14:23 (UKJV) And you shall eat before the LORD your God, in the place which he shall choose to place his name there, the tithe of your corn, of your wine, and of yours oil, and the firstlings of your herds and of your flocks; that you may learn to fear the LORD your God always.

21Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.

22Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.

23Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.

24Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),

25mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.