3Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.
4Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
5na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
6Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri.
7Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.