2Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye Onyenwe anyị Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka Onyenwe anyị họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya.
3Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.
4Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
5na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
6Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri.