Diuteronomi 15

Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.

Deuteronomy 15:10 (UKJV) You shall surely give him, and yours heart shall not be grieved when you give unto him: because that for this thing the LORD your God shall bless you in all your works, and in all that you put yours hand unto.

8ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ.

9Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara.

10Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.

11A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.

12Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.