12Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha.
13Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu!
14Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị.
15Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa.
16Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ.