Diuteronomi 15

ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.

Deuteronomy 15:5 (UKJV) Only if you carefully hearken unto the voice of the LORD your God, to observe to do all these commandments which I command you this day.

3Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.

4Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu,

5ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.

6Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.

7Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.