Diuteronomi 15

Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.

Deuteronomy 15:3 (UKJV) Of a foreigner you may exact it again: but that which is yours with your brother yours hand shall release;

1Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.

2Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola.

3Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.

4Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu,

5ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.