Diuteronomi 15

Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.

Deuteronomy 15:1 (UKJV) At the end of every seven years you shall make a release.

1Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.

2Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola.

3Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.