1Debe ọnwa Abib iche maka ime Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị.
2Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya.
3Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ.
4Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ.