18Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile.
19Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
20Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
21Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye Onyenwe anyị Chineke gị.
22Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ asị.