16Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu Onyenwe anyị.
17Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị gọzie ya.
18Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile.
19Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
20Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.