Diuteronomi 17

Achụrụla Onyenwe anyị bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.

Deuteronomy 17:1 (UKJV) You shall not sacrifice unto the LORD your God any bullock, or sheep, wherein is blemish, or any evil thing: for that is an abomination unto the LORD your God.

1Achụrụla Onyenwe anyị bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.

2Ọ bụrụ na ị nụ na onye ọbụla nʼime obodo ndị ahụ Onyenwe anyị nyere gị, nwoke maọbụ nwanyị na-eme ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị ime ihe megidere ọgbụgba ndụ ya,

3ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.