12Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ.
13Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako.
14Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”
15O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị.
16Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”