14Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”
15O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị.
16Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”
17Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke.
18Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze.