Diuteronomi 17

kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.

Deuteronomy 17:5 (UKJV) Then shall you bring forth that man or that woman, which have committed that wicked thing, unto your gates, even that man or that woman, and shall stone them with stones, till they die.

3ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu,

4ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel,

5kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.

6Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.

7Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.