5kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.
6Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.
7Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
8Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,
9nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.