Diuteronomi 17

nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.

Deuteronomy 17:9 (UKJV) And you shall come unto the priests the Levites, and unto the judge that shall be in those days, and enquire; and they shall show you the sentence of judgment:

7Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.

8Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,

9nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.

10Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.

11Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.