15E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
16Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
17Onyenwe anyị sịrị m,
18“Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
19Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”