14Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.
15E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
16Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
17Onyenwe anyị sịrị m,
18“Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.