18“Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
19Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”
20Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum.
21Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.
22Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa.