Diuteronomi 2

Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.

Deuteronomy 2:35 (UKJV) Only the cattle we took for a prey unto ourselves, and the spoil of the cities which we took.

33Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.

34Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.

35Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.

36Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.

37Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.