2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m,
3“Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu.
4Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
5Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
6Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’ ”