4Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
5Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
6Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’ ”
7Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
8Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.