9Mgbe ndịisi agha gwachara ndị agha ha okwu ndị a, ha ga-ahọpụta ndịisi ga-achịkọta usuu ndị agha.
10Mgbe ị bịaruru obodo ọbụla nso ibuso ya agha, ị ga-ebu ụzọ kpọọ ndị bi nʼime ya oku, maka ime udo.
11Ọ bụrụ na ha anabata ime udo, megheere gị ọnụ ụzọ ama ha, ndị niile bi nʼime obodo ahụ ga-abụrụ gị ndị ọrụ na-agbakwara gị odibo.
12Ma ọ bụrụ na ha ekweghị ime udo, lụso gị agha, mgbe ahụ, ndị agha gị ga-agba ya gburugburu.
13Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị nyefere gị ya nʼaka, were mma agha gbuo nwoke ọbụla nọ nʼime ya.