Diuteronomi 21

Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya.

Deuteronomy 21:14 (UKJV) And it shall be, if you have no delight in her, then you shall let her go where she will; but you shall not sell her at all for money, you shall not make merchandise of her, because you have humbled her.

12Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile,

13yipụ uwe ahụ o yi mgbe e jidere ya. Ọ ga-anọdụ nʼụlọ gị ruo ụjụ nʼihi nna ya na nne ya otu ọnwa. Emesịa, i nwere ike ịbakwuru ya ghọọ di ya, ya onwe ya ga-aghọkwa nwunye gị.

14Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya.

15Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke,

16mgbe nwoke ahụ na-eke ihe onwunwe ya, ọ gaghị ewere oke ruuru ọkpara ya, nke nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị mụtara kenye nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ hụrụ nʼanya mụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.