17Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya.
18Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị.
19Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha.
20Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.”
21Ndị ikom niile nke obodo ahụ ga-ewere nkume tugbuo ya. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ahụ nʼetiti unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe mere, ụjọ ga-atụkwa ha.