15Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke,
16mgbe nwoke ahụ na-eke ihe onwunwe ya, ọ gaghị ewere oke ruuru ọkpara ya, nke nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị mụtara kenye nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ hụrụ nʼanya mụrụ.
17Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya.
18Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị.
19Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha.