Diuteronomi 21

ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.

Deuteronomy 21:2 (UKJV) Then your elders and your judges shall come forth, and they shall measure unto the cities which are round about him that is slain:

1Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya,

2ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.

3Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla

4ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.